audio
audio
text
string
english
string
Ọnwa iri abụọ na-emezu otu afọ.
Twelve months completes one year.
Nwa m dị afọ anọ.
My child is four years old.
Afọ ole ka i biri ebe ahụ?
How many years did you live there?
Ihe mberede ahụ buru ya ajụ.
The accident made her dizzy.
Eziokwu a na-ebu aju.
This truth causes dizziness.
Mmanya m ṅụrụ na-achọ ibu m ajụ.
The wine that I took is about to make me feel dizzy.
Agbala m buo ya ajụ ka ọ daa.
My deity make him dizzy so that he can fell
Ọru a na-ebu ajụ.
This job causes dizziness.
Ụra ọ mara m buru m ajụ.
The slap he gave me caused me dizziness.
Onye ka ajụ buru?
Who was dizzy?
Ọgwụ ọ ṅụrụ na-ebu ya ajụ.
The drug he took is making her dizzy.
Mmanya ọcha na-ebu ajụ.
Palm wine causes dizziness.
Ọ bụ gịnị na-ebu gị ajụ.
What is making you dizzy.
E wepụtara ya arị n'anya.
Filarial worm was brought out from his eyes.
Ọ rịara arị.
He had filariasis.
Chineke ji ajị chọọ nwoke a mma.
God used hair to beautify this man.
Ajị dị ya n'aka ka m ji mata na ọ bụ ya.
The hair on her hand made me know it's her.
Ọkụ rechapụrụ ajị niile dị ya n'ahụ.
Fire burnt all the hairs on its body.
Ihe a bụ ajị ewu.
That is the hair of a goat.
Ọ dọrọ m n'ajị.
She pulled my hairs.
Ọ gbara nnukwu ajị.
He grew many hairs.
Ana m anụ isi ajị ewu na-ere ọkụ.
I can perceive the smell of burning goat's hairs.
Aji ahụ ya na-adasị̣sị.
His body hair are falling off.
Ajị ya na-acha anwụ anwụ.
His hair is brownish in colour.
Ihe a fopuru ma ajị n'ahụ.
The issue pulled hair from my body.
E nwere onye na-arụ ụlọ n'agbata nke gị.
There is someone building a house beside yours.
O teela m gadobere n'agbata unu.
It has been long I last went to your neighborhood.
Nkwụ ahụ dị n'agbata mụ na gị.
The palm tree is between you and me.
E nwere otụtụ ụleelu n'agbata anyị.
There are many upstairs in our neighbourhood.
Ọ bụghị onye gbara akwụkwọ na-ekpegbu.
It is not the person who took a case to court that wins.
A ga-agba unu akwụkwọ ma ụnụ mee ya ọzọ.
You will be prosecuted if you do it again.
Onye nwe ụlọ ahụ gbara ha akwụkwọ maka na ha ekweghị akwụ ụgwụụlọ.
The landlord of that house sued them because they refused to pay house rent.
Nkịta ya na-ata arụ.
His dog bites.
Nwata a na-ata nwanne ya arụ.
This child is biting his sibling.
Taa ya arụ nke gị!
Bite him your own!
Nwata a tara nwanne ya arụ.
This child bit his sibling.
Ụjọ atụla gị, ọ chọghị ịta gị arụ.
Don't be scared, it does not want to bite you.
A na-eji osisi icheku arụpụta ngwụụlọ.
The wood of black Velvet Tamarind is used in making furniture.
Icheku na-atọkarị ụtọ n'udummiri.
Velvet tamarind is sweeter in rainy season.
Icheku na-amasị ụmụaka nke ukwuu.
Children often like velvet tamarind.
Mkpụrụ icheku na-eji oji.
Velvet tamarind is black in colour.
Azụtara m icheku n'ahịa taa.
I bought velvet tamarind from the market today.
Icheku anaghị ada ọnụ n'ahịa.
Velvet tamarind is not expensive at the market.
Onye nwe icheku a?
Who owns this velvet tamarind?
Icheku a adighị ụtọ.
This velvet tamarind is not sweet.
Ada na-ere icheku n'ahịa.
Ada sells velvet tamarind at the market.
Achọrọ m ịcha ha irighiri.
I want to cut them to pieces.
Ọ bọrọ gị ntọọọ mgbe ikpere gị zuru n'ibo?
Did she mock you when your knee collided with the door?
Ọ dịghị nma ịbọ mmadụ ntọọọ.
It is not good to mock someone.
Onyenkuzi pịara ya ụtarị maka na ọ bọrọ m ntọọọ.
The teacher flogged her because she mocked me.
Obere nwa a na-abọ mmadụ ntọọọ
This little child mocks people.
Anyị hụrụ akwa abụọ n'akwụ ahụ.
We saw two eggs in that nest.
Akwụ nnụnụ ahụ dara n'ala.
The nest of that bird fall on the ground.
Akwụ abụọ ka anyị hụrụ n'osisi ahụ.
We saw two nests on that tree.
Ikuku bupụrụ akwụ nnụnụ ahụ.
Wind blew off the nest of that bird.
Akwụ asha naghị esi ike.
Weaver nest is not strong.
Nza na-enwe nnukwu akwụ.
Wren has a big nest.
Ugolooma na-akpa ogologo akwụ.
Crow builds a long nest.
Nnụnụ nwe akwụ a bụ ichooku.
The bird that has this nest is parrot.
Agwọ batara n'akwụ ya.
Snake came into the nest.
Nnụnụ a na-arụ akwụ ọzọ.
This bird is building another nest,
Ugo tinyere nwa ya n'akwụ.
The eagle put it eaglet inside the nest.
Mmiri mebiri akwụ nnụnụ ahụ.
Rain destroyed the bird's nest.
Nnụnụ ahụ kpara akwụ ya n'ala.
The bird built its nest on the ground.
Nza na-enwe nnukwu akwụ.
Wren has a big nest.
Ikuku bupụrụ akwụ nnụnụ ahụ.
Wind blew off the nest of that bird.
Agwọ batara n'akwụ ya.
Snake came into the nest.
Akwụ abụọ ka anyị hụrụ n'osisi ahụ.
We saw two nests on that tree.
Anyị hụrụ akwa abụọ n'akwụ ahụ.
We saw two eggs in that nest.
Akwụ nnụnụ ahụ dara n'ala.
The nest of that bird fall on the ground.
Akwa dị n'akwụ ahụ.
There is egg in the nest.
Mmiri mara akwụ ahụ.
Rain beat the nest.
Akwụ asha naghị esi ike.
Weaver nest is not strong.
Ugolooma na-akpa ogologo akwụ.
Crow builds a long nest.
Nnụnụ nwe akwụ a bụ ichooku.
The bird that has this nest is parrot.
Nnụnụ a na-arụ akwụ ọzọ.
This bird is building another nest,
Mmiri mebiri akwụ nnụnụ ahụ.
Rain destroyed the bird's nest.
Ugo tinyere nwa ya n'akwụ.
The eagle put it eaglet inside the nest.
Nnụnụ ahụ kpara akwụ ya n'ala.
The bird built its nest on the ground.
Kedụ ụmụ agbọghọbịa nọ ebe a?
Where are the young ladies here?
Ọ dị mma ka agbọghọbịa ọbụla nwee ọrụaka.
It is good for every young lady to have a handwork.
Naanị ndị agbọghọbịa ga-agba egwu.
Only the maidens will dance.
Ụmụ agbọghọbịa nwere mmemme taa.
Young ladies have an event today.
Naanị ụmụ agboghobịa na-anọ n'otu a.
Only young ladies stay in this group.
Bịa, bo m ibu a n'isi.
Come and put this load on my head.
O boro m ebubo.
He accused me.
Ọ ga-ebo gị ebubo ụgha.
She will accuse you falsely.
Ọ na-ebo Adanne ibu ahụ mgbe anyị batara.
She was placing the load on Adanne's head when we came in.
Ọ na-ebokarị ndị mmadụ ebubo.
He is always accusing people.
Onye boro gị ibu arọ a?
Who put all this heavy load on you?
Ọ dịghị mma ibo ya nnukwu ibu.
It is not proper to place a heavy load on his head.
O boro m ibu.
He place the load on my head.
Achọrọ m ibo ya ibu.
I want to place the load on her head.
Akwamoozu ya ga-abụ n'ọnwa ọzọ.
His burial will be next month
Anyị ga-eje akwamoozu echi.
We will attend a funeral tomorrow.
Anyị họpụtara ndị ga-anochite anya anyị n'akwamozu nna ya.
We delegated people that will represent us in his father's funeral.
Akwamozu ya gara nkeọma.
His funeral was successful.
E mere akwamoozu ya ụnyaahụ.
His funeral was done yesterday.
Ndị egwu ama ama gụrụ egwu n'akwamoozu ya.
Popular musicians sang at his burial.
Ọtụtụ mmadụ gara akwamoozu ahụ.
A lot of people went for that burial.