audio audio | text string | english string |
|---|---|---|
Aga m enye gị akpụụkwụ̣ a, ebe ọ bụ na ọ masịrị gị. | I will give you this shoe, since you like it. | |
Nke m dị ọcha, ebe nke Onyeka dị oji. | Mine is white whereas Onyeka's is black. | |
O chirụrụ ọkpa ebe ọ na-agba ọsọ. | She bruised her leg while she was running. | |
'Ch' bụ mgbochiume. | 'Ch' is a consonant. | |
Mkpụrụokwu a nwere 'ch' abụo. | This word has two 'ch'. | |
Depụta okwu abụọ bidoro na 'ch'. | Write out two words that start with 'ch' | |
'Ch', 'i', 'd', 'ị' bụ nsụpe Chidị. | C, h, i, d, i is the spelling of Chidi. | |
Edekwala 'ch' n'akwụkwọ gị. | Don't write 'ch' in your book. | |
Hichaa 'ch' a ị dere ebe a. | Erase this 'ch' you wrote here. | |
Anyị tọrọ ntọala otu anyị taa. | We established underlying principles of our organization today. | |
E ji Chineke atọ ntọala ihe niile. | God is used to establish all foundations. | |
Anyị ga-atọ ntọala ya echi. | We will establish the foundation tomorrow. | |
Nna m ga-atọ ntọala ụlọ ahụ. | My father will establish the foundation of the house. | |
Aṅa ahụ agbajiela. | That cane is broken. | |
Aṅa apịara ya hapụrụ apa n'ahụ ya. | The cane he was flogged left a scar on his body. | |
Ada nwe oche eji aṅa kpaa. | Ada has a cane chair. | |
Nna ya na-apịa ya aṅa oge ọbụla o mere ihe ọjọọ. | His father flogs him whenever he does something bad. | |
Wetara aṅa n'ebe ahụ. | Get me a cane there. | |
Ọ dị ime ọnwa atọ. | She is three months pregnant. | |
Dịrị ime. | Become pregnant. | |
Ọ dị ime. | She is pregnant. | |
Ọ ga-adị ime. | She will become pregnant. | |
Olu gị na-ada ụda. | Your voice is loud. | |
Mmemme agbamakwụkwọ ha dara ụda. | Their wedding party was loud. | |
Ị kụọ aka n'ọnụ ụzọ m, ọ ga-ada ụda. | If you knock on my door, it will make a sound. | |
Opi ụgbọala ya na-ada ụda hie nne. | The horn of his car makes a lot of sound | |
Akwamozu ahụ dara ụda na be anyị. | The funeral ceremony was recognized in our community. | |
Mkpọnaanị ya na-ada ụda ọfụma. | His canons shots makes very loud sound. | |
Ọ dara ụda. | It made noise. | |
Ihe niile ọ na-eme na-ada ụda. | Everything he does is loud. | |
Mkpọnaanị ya na-ada ụda ọfụma. | His canons shots makes very loud sound. | |
Opi ụgbọala ya na-ada ụda hinne. | The horn of his car makes a lot of sound | |
Mmemme agbamakwụkwọ ha dara ụda. | Their wedding party was loud. | |
Ị kụọ aka n'ọnụ ụzọ m, ọ ga-ada ụda. | If you knock on my door, it will make a sound. | |
Olu gị na-ada ụda. | Your voice is loud. | |
Akwamozu ahụ dara ụda na be anyị. | The funeral ceremony was recognized in our community. | |
Achọghị m ka ọ daa ụda. | I do not want it to make noise. | |
Mmemme a adaghị ụda etu m si chọo. | The ceremony is not as popular as I expected. | |
Nne ya so na ndị chiri echichi. | His mother is among the title holders. | |
Nna gị e chiri echiche? | Do your father have a title? | |
A na-echi ndị mmadụ echichi dịka ha si ebi ndụ ha. | Titles are bestowed on people based on their lifestyle. | |
Achọghị m ichi echichi ahụ. | I do not want to take the title. | |
E chiri nne m echichi ịyọm. | My mother was given the ịyọm title. | |
Kedụ ndị chiri echichi ebe a? | Which people have a title here? | |
Nnannukwu Ebuka kpọọrọ anyị ụbọakwara ụnyaahụ. | Ebuka's grandfather played the guitar for us yesterday. | |
Anyị ji ụbọakwara fee Chukwu n'ụlọ anyị. | We worshipped God with guitar in our house. | |
Ọ maara akpọ ụbọakwara nke ọma. | He knows how to play the guitar well | |
Ụbọakwara ahụ ọ zụtara ọhụrụ ka o ji bịa. | He came with that his new guitar. | |
Amaghị etu ụda ụbọakwara si ada. | I don't know the sound of a guitar. | |
Ada na-aṅụ mmiri ka awọ. | Ada drinks water like a frog. | |
Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n'efu. | The toad does not run in the day time for nothing. | |
Emeka nwụtara awọ. | Emeka caught a frog. | |
Awọ na-eyi akwa. | Toad lays eggs. | |
Ọ na-ata awọ. | He is eating toad. | |
O sere awọ n'akwụkwọ ya. | He drew a frog in his book. | |
Not supported with pagination yet | Na-aga n'ihu, ị ga-ahụ ebe ụzọ gbara aba abụọ. | Keep going forward, you will see where the road diverged into two. |
Anyị guzoro n'eziama ruo mgbe ọ chọtara ọtụchi iboama anyị. | We stood outside the compound until he found the keys to our gate. | |
Ha dọrọ akụoyibo n'eziama ha. | They planted a coconut tree in front their compound. | |
Ndị mmadụ gbakọrọ n'eziama nna m. | People gathered outside of my father's compound. | |
Anyị na-abọcha eziama anyị. | We are weeding the front of our compound. | |
Ihe mberede ahụ mere n'eziama ha. | The accident happened outside their compound. | |
Ezinụụlọ anyị na-abawanye. | Our family is increasing in number. | |
Ọ bawanyere mgbe ọ pụrụ. | It increased in number when he left. | |
Eze achọghị ịbawanye ụba. | Eze does not want to get richer. | |
Ịbawanye ụlọ anyị ga-arụ abụghị ihe a ga-eji obere ego mee. | To increase the number of house we will build is not something that will be done ith small money. | |
Ọnụọgụgụ ndị enweghị ọrụ na-abawanye kwa afọ. | The number of unemployed increases every year. | |
Ejike bawanyere ụba. | Ejike got richer. | |
Ndị na-eje ụka anyị na-abawanye ụbọchị ọbụla. | Those who attend our church increases in number everyday. | |
Mee ya ka ọ bawanye. | Make it to increase. | |
Gịnị ka ị na-eche? | What are you thinking about? | |
Gịnị ka iche ọ ga-eme? | What do you think she will do? | |
O chere maka ihe a. | She thought about this thing. | |
Ọ na-eche maka nwa ya. | She is thinking about her child. | |
Iche na mụ dị nzuzu? | Do you think I am foolish? | |
Chee ya nke ọma. | Think about it very well. | |
Oke iche uche adịghị mma. | Too much thinking is not bad. | |
O cheghị echiche tupu mee ihe o mere. | He did not think before doing what he did. | |
A ga-ebi ya ugwu? | Will he be circumcised? | |
Mmanya ebego ugwu. | The pot of wine is no longer full. | |
Ada biri nwa ya ugwu. | Ada circumcised her child. | |
Ana-ebi nwa ahụ ugwu ya mere o ji ebe akwa. | That child is being circumcised that is why he is crying. | |
Ya na nne ya so gaa ibi nwa ọhụrụ ahụ ugwu. | She and her mother followed to circumcise the child. | |
Kedu ngwaọrụ eji ebi ugwu? | What instrument is used for circumcision? | |
Ebighi ya ugwu. | He was not circumcized. | |
Ụfọdụ obodo na-ebi nwaanyị ugwu. | Some country circumcise female child. | |
Ị ga-enye m ego m taa. | You will give me my money today. | |
A ga m eme ya. | I will do it. | |
Hapụ ya ka ọ dado n'ahụ aja. | Allow it to fall on the wall. | |
Ekwela ka ọ dado ya n'ike. | Don't allow it to fall upon it with force. | |
Alaka osisi oroma ahụ dadoro n'elu ụlọ m. | The branches of that orange tree fall on top of my roof. | |
Ọ na-adado ya ma ọ bụrụ na ọ kwụghị ọtọ nke ọma. | It falls and stay on it if it is not well erect. | |
Bupụ akpa gị n'ezi. | Carry your bag outside. | |
Ha ga-ebupụ oche niile ndị ahụ. | They will carry away all those chairs. | |
Ibupụ ụgbọala ahụ n'okporoụzọ agaghị adị mfe. | To carry away that vehicle from the road, will not be easy. | |
Anyị na-ebupu ya ugbua. | We are carrying it away now. | |
Ha mesịrị bupụọ ngwongwo ha. | They later carried away their properties. | |
Bupụ akpa gị n'ezi. | Carry your bag outside. | |
Ha ga-ebupu gị iro. | They will carry you outside. | |
Ibupụ ụgbọala ahụ n'okporoụzọ agaghị adị mfe. | To carry away that vehicle from the road, will not be easy. | |
Ha ga-ebupụ oche niile ndị ahụ. | They will carry away all those chairs. |
Subsets and Splits
No community queries yet
The top public SQL queries from the community will appear here once available.