Igbo
stringlengths
1
29.2k
source
stringclasses
2 values
Okiro kwuru na iwe na ọrụ a ga-enyere aka ime ka ha kwudosie ike karịa ka ha dị na mbụ.
Leipzig Corpus Collections
Okocha kọọrọ ọnụ gàba n’ihu, na-ekwu na o nweghị ihe Obiano ma maka ọchịchị, na o na-ewechigha aka elekere azụ n’Anambra steeti.
Leipzig Corpus Collections
Ọkọlọtọ anyị nso awade ruo 100Mbps throughput na anyị HT nso awade na ngafe nke 230Mbps dabere na nnyefe gburugburu ebe obibi.
Leipzig Corpus Collections
Ọkọlóto Végíníyà Ébé Virginia nọr na Amerika Àkù-ñkịtị nke Virginia bu otu nkeji obodo nọr nà Njikota Obodo Amerika nke nọr na ikpele ya nke Atlantic na Nledà anyanwu Njikota Obodo.
Leipzig Corpus Collections
Okonkwo na-akuzi nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe di n'Awka.
Leipzig Corpus Collections
Okonkwo na-akuzi nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe di n'Awka..
Leipzig Corpus Collections
Ọ kọrọ akụkọ otu Naijiria siri maa mma na mbụ mbụ, ma kwuo na ịchọ ịdịkọ n’otu abụghị ya bụ ebe okwu jedebere kama ime ka obodo kwudosie ike n’ụzọ kwesiri ekwesi.
Leipzig Corpus Collections
Okorobịa na Dimkpa Agụ ha ji akpa nganga – Ikechukwu Ọnwụzurike - etibiri n’ike nwụọ!
Leipzig Corpus Collections
Okorocha bụ gọvanọ ha, ji ụgwọ ọnwa ha akpọ owu..
Leipzig Corpus Collections
Okorocha gara n’ihu were kwuo ka ndị nta akụkọ nọ na ọwụwa anyanwụ nke Naijiria, tulee were họrọ ya na Obiano onye ka mma, site n’ọrụ ha abụọ rụrụ na steeti ha.
Leipzig Corpus Collections
Okorocha: ndị nara ezumike nka ọrụ, ụnụ ga-echefuriri ụzọ isii n’ụzọ iri ụgwọ m ji ụnụ.
Leipzig Corpus Collections
Okorocha onye bụ gọvanọ steeti Imo, ụnyaahụ, e kwuọla ihe kasi agụ ya ugbu a. Mgbe ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ, ka ọ gwara ha, na ịbụ gọvanọ pere mpe maka ụdị mmadụ ya, na ihe kwesiri ịbụ oke ya bụzi ịbụ prezidenti nke Naijiria.
Leipzig Corpus Collections
Ọkọrọtọ a bụ nanị maka ikwalite asụsụ Igbo na ọnọdụ ndị igbo site n’ụdị abụla ụzọ mụọ gị gwara gị ugbu a dị mma.
Leipzig Corpus Collections
Ọkọrọtọ a, ga-enyere aka maka i kwalite asụsụ Igbo site na iji ya na-ede ihe nile gbasara ihe dum na-eme n’ụwa, ọ kachasị nke metụtara ndị Igbo.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kọwapụtakwara ịhe ndị ha kpatara na nzukọ ya na ụlọ ọrụ A kpọrọ Food and Agriculture Organisation n’olu bekee n’obodo Rome nke mba Italy.
Leipzig Corpus Collections
Ȯ kòwàrì na ndi áhù si umunna ha kpachákwá anya Í nọr nga na ha gí fwüor Omaha, màkà ihe Earl Little ne mè na UNIA nà "gbásà nsogbu".
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọkukwara ndị nta akụkọ ma dụọ ha ọdụ ka ha mee ezigbo nchọpụta tupu ha agbasara ọha n’eze ozi nwere ike ibute ọgbaghara.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọkuru gọọmenti mba Sautu Afrịka ka ha were ọsọ were ije mee ka ndị mba ahụ kwụsị ibu agha megide ndị ọbịa bi na mba ha.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọkuru ndị Naịjirịa ka ha kwado gọọmenti n'ime ka ọchichi onye kwuo uche ya nọgide.
Leipzig Corpus Collections
O kpọkuru ndị ọka ikpe obodo ka ha kpe ikpe dị n’etiti ya na Ngwere.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọkuru onye isi ala ka O leba anya n’ihe E kwekọtara n’ọgbakọ ezumezu nke afọ 2014 ka E nwe ike ibu agha megide mpụ.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọrọ ndị ahịa ka ha na-akwụ ụtụ isi ha n’oge, yana otu kwesiri ekwesi.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọrọ oku ka a na-ekpesiri Naịjiria ekpere ike tụmadị n’oge a ndị Boko Haram na-ebusa ala Naịjiria agha iyi egwu.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọrọ oku ka ụwa niile nyere gọọmenti Nigeria aka n’ibusa ndị Boko Haram agha.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọrọ otu abụọ ahụ oku ka ha chịsa okwu niile ha nwere n’agugu ala ma sonye na mkparịta ụka udo maka ọdimma onye ọbụla.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kpọrọ ya bụ nwa laa be ya, wee nye ndị nwunye ya isii nnukwu ego.
Leipzig Corpus Collections
Okpuru ya ruru ebe mmiri a na-akpobu Bight of Biafra nke a gbanwere Gulf of Guinea di.
Leipzig Corpus Collections
Ọkụ anyụọla ebe a, ya bụ ka anyị kwụsị zie.
Leipzig Corpus Collections
Ọkụ gbagburu igwe mmadụ ruru 300 ebe ha na-ezu oshi mmanụ petrol n’ebe ndị omekome kụpuru igwe paypụ na-ebu mmanu.
Leipzig Corpus Collections
Ọkụ gbagburu mmadụ 95. Mmadụ 18 merụrụ ahụ.
Leipzig Corpus Collections
Ọkụkọ na-eyi akwa a ga-azụ ebe ahụ ga-akarị otu nde!
Leipzig Corpus Collections
O kwàdọrọ onye Africa-Nílé Marcus Garvey na ȯ bu mgbe áhù onye íshí Universal Negro Improvement Association (UNIA).
Leipzig Corpus Collections
O kwa emesịa agwa anyị na ego adịghị, na a ga-eme ka ụtụisi ndị mmadụ na-atụ karịa ka ọ dị na mbụ.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kwa ịma otu ahụ ọ ga-abụ onye nne chọọ inye nwa ya ihe dikà anụ, ọ tarisie ya, o minye ya n’ ọnụ nwa ya?
Leipzig Corpus Collections
O kwa na'eme ndi madu echeta na ha kweshiri i bu ndi oma.
Leipzig Corpus Collections
O kwe gị meenwuo, ịzụta busu debe ka o chụsasịa oke nile dị na be gị.
Leipzig Corpus Collections
O kwenyere ha were nyiri ogbunigwe n’iba ya were banye n’ugboelu bu ihe ruru mmadụ 300 si Amsterdam aga Detroit.
Leipzig Corpus Collections
O kwenyere na nhọpụta ahụ e mere, mana ka onyochasịrị ihe ọ ga-ahapụ, o fere isi kpakakpaka, jụụ na o gaghị enye Barrow ikike iwere ọchịchị mba Gambia.
Leipzig Corpus Collections
Okwesighi ka e chetara ndi igbo na “aga ala ala, anaghi eme ya nchezo.”
Leipzig Corpus Collections
O kwesiri ịnyị ya arụ, maka na ihe a madoro ya n’ihu karịrị akarị.
Leipzig Corpus Collections
O kwesiri ka anyị mara n’ebe esi ebute ọrịa a bụ site na ihe bara n’onụ na nke si n’otule(ike) were bata.
Leipzig Corpus Collections
O kwesiri na ọbara ga-ebuga shuga n’akụkụ ahụ dị iche iche ma mgbe o meghi nke a nsogbu dị.
Leipzig Corpus Collections
Ọ kwọrọ ya bụ nwata gàba na mmiri.
Leipzig Corpus Collections
Okwu abụghị obere ihe.
Leipzig Corpus Collections
Okwu abụghị obere okwu..
Leipzig Corpus Collections
Okwu abụọ a, n’ikpeazụ, otu nwere ike ịbụ eziokwu.
Leipzig Corpus Collections
Okwu a bụ okwu Igbo bụ eziokwu.
Leipzig Corpus Collections
Okwu ahụ a na-ekwu na onye amuma anaghị adị ire n’ala nna ya, abụghị maka ya.
Leipzig Corpus Collections
Okwu a “Lent” bụ okwu mgbe ochie, nke ndị “Anglo-Saxon” pụtara oge “Spring”, mgbe osisi ji ewepụta ufuru na akwụkwọ ndụ.
Leipzig Corpus Collections
Okwu anaghị akọ Mbe n’ọnụ, ọ zaa Chukwu, “ Nna m, esighi m ebe ndị a, ebe m si were bịa bụ na mpio nke were ọwa mmiri ideyi”.
Leipzig Corpus Collections
Okwu Chief Stephen Osita Ọsadebe bụ abụ ọma dị nsọ bụrụ kwa eziokwu.
Leipzig Corpus Collections
Okwu dịka 'enwela ogbaaghara' na 'udo' ka a na –ewebata kwa mgbe iji rụọ arụmaarụ ụka kwụ ọtọ nke na-eduba n’ịnọ jụụ Antonino Drago, "Nonkilling Science", in Toward a Nonkilling Paradigm, edited by Joám Evans Pim.
Leipzig Corpus Collections
Okwu di otu a anaghị eso iwu ndakọrịtà ụdaume na e na-ede ha.
Leipzig Corpus Collections
Okwu gbásárá àgwà àhú ya bịdọrọ Í di kwá mkpà na ndu Malcolm mgbe ó tòchàrà.
Leipzig Corpus Collections
O kwughị ebe o chọrọ ịga, n’ihi nke a, ha achọghị inye ya ya bụ ego.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwara na ịhe ọzọ kacha mkpa ha na-eme bụ itinye ezigbo nchekwa.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwara na ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị otu di iche iche nwere mmasị ihụ na Biafra bụ ihe pụtara ihe, na ọtụtụ ndị otu a chọkwaziri ka ihe mmegbu a na-egosi Nnamdi Kanụ kwụsị.
Leipzig Corpus Collections
Okwukwara n’ịkwado ndị gọọmenti steeti ka ha na-aga n’ihu n’ikwado iwulite ndị ntorobịa bụ mkpebi nke ọchịchị ya.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwaziri ka ụlọikpe ECOWAS manye gọọmenti etiti ịhapụ ya ka o gabara onwe ya.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwaziri na ha chọrọ ka e nye ha ọrụ ichekwa ọwa mmanụ si aga na steeti Ogun na Legos.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwaziri na ha ga-agba mbọ iji hụ na nsogbu nile nke na-adapụta na Naijiria ugbu a bụ nke e jiri udo were gbochie, n’ihi na-ejighị ọsọ agbakwu ọgụ.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwaziri na ndị nile gbara ọsọ ndụ site n’obodo ha gbata Amerịkà na agaghị anabata ha ganye na ọnwa ano agasịa.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwaziri na obi dị ya ụtọ otu ụfọdụ ndị okenye ndị Awụsa siri kulie n’otu olu gwa ndị na-eto eto ka ha were ya nwayọọ.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwaziri na ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka eji aracha ofe di ọkụ, n’ihi nke a, gọọmenti Naijiria ugbu a kwesiri iji nwayọọ na ndidi na-eso ndị ahụ na-akpọ oku maka Biafra.
Leipzig Corpus Collections
O kwukwaziri na o doziri ewu na ọkụkọ anya na Buhari atụgharịala obodo ka ọ bụrụzie nke ndị ji ike nile bụzi ndị “uwe ojii”.
Leipzig Corpus Collections
Okwu nka di kwa otu o dị na o nweríkí nwe ihe o na si di ukwu.
Leipzig Corpus Collections
O kwuo na ọ hụrụ akpa nnu n’ ụzọ, o nweghị onye ọ hụrụ bu ya n’isi, nke a mere ka o buru ya bụ akpa buba be ya, na Obinigwe mere ya ogo.
Leipzig Corpus Collections
Okwu ọzọ dị mkpa e kwuru na nzukọ ahụ bụ otu a ga-esi wete njikọ aka n’etiti otu jikọrọ mba ndị e nwere na mpaghara ime ime Afrịka, nke a na-akpọ Economic Community of Central African States, n’olu bekee.
Leipzig Corpus Collections
O kwuputere nke a n’okwu ya n’ọgbakọ ihe nkụzi nke afọ puku abụọ na iri na isii nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi Federal Radio Corporation of Nigeria (FRCN).
Leipzig Corpus Collections
O kwuru ka ndị mmadụ dụọ Buhari ọdụ ka ọ mara na anyị nọ n’ọchịchị onye kwuo uche ya, ya marakwazie na ndị okpukperechi nke ndị otu Kristi kwesiri inwe ugwu na nsọpụrụ dịrị ha.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na abịa na nzukọ maka nchekwa obodo na otu mkpụrụ onye Igbo anọghị ya.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na-abịa na ya bụ nzukọ, na-aga akpa otu a ga-esi mee ka edozie ọchịchị Naijiria ụzọ isii, nke ga-agbado ụkwụ na nkewa isii nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ala Naijiria.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na-agbanyeghi ihe ọjọọ nile ndị PDP mejupụtara na Naijiria, na Buhari ewetara nnukwu mgbanwe pụtara ihe na Naijiria.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na agha Naijiria gbusoro ndị Biafra mgbe ahụ bụ nke ịhụnanya, na ha achọghị igbuchapụ ndị Igbo nile, kama na ọ bụ maka ịhụnanya ha nwere n’ebe ịdịkọ n’otu nke Naijiria ka ha ji were bagide ndị Biafra agha.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ahụ siri Buhari ike, na ọ bụ ezumike ka ọ gara inwete.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na a kpọọ ya ka ọ zọọ ọchịchị ịbụ onyeisi ala Naijiria, na ọ ga-eme nke ahụ na ọ bụrụ na ohere dị n’Abuja.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na Amerịkà ga-achakwasị Iran ọkụ dị egwu iji hụ na ihe dị otu ahụ emeghị ọzọ.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na bọjeeti kwesiri ịbụ nke a ga-eji mee ka ahụhụ na ihe isiike belata n’obodo a. E kwesiri ime ka ọtụtụ nwete ọrụ, ma mee ka ekepụta ọrụ n’ime obodo gasị.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na Buhari ịkpọ ya n’ekwentị bụ ihe ọma ka wee mere ya kemgbe afọ a. Na ọ chọghị inye Buhari nsogbu site n’ịkpọ ya, ganye na Buhari n’onwe ya, achọọ ka ha kpaa nkata.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na Buhari kwesiri ịma n’ọchịchị onye kwuo uche ya siri nnukwu ike, ma bụrụ ụdị ọchịchị kacha mma n’ ụwa nile.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na Buhari zọrọ ya ugboro anọ tupu o nwete ohere, na nke ahụ gosiri na ọ ma ihe ọ chọọ.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na chi ya agoziela ya, o sekpuru ala kele nna nna ya.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ebumnobi ndị nụrụ ya bụ agha bụ ịrụpụta na inwe obodo a ga-eji were na-eme ọnụ.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ego adịghịzi ka ọ na-adị na mbụ, ebe niile kpọchiri akpọchi.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ekele ga-agara ọtụtụ mmadụ nkịtị ndị nke chekwabara ihe ndị Igbo di n’ala ha.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru n’agbanyeghị ihe ndị a, na ha ebidola ọrụ.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru n’agha abụghị nanị nke A ga-ahapụrụ ndị EFCC, ICPC na ndị uwe ojii.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na gọọmenti a chọghị inye ha ego nke eji were gbaghara ndị agha iwe omekome ibe ha.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na gọọmenti ga-elebarịrị anya n’ ihe iche aka mgba niile a iji mee ka ngalaba ahụ ike kwụrụ chịm.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ha apụghị ịkwụsị ọrụ ya dịka dike n’agha n’iruso wuruwuru agha na Naijiria.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na ihe nile mere ụbọchị ahụ ruru mba ụwa nile ntị, ndị otu ha ka nọ n’aka ndị nchekwa obodo bụkwazi ndị ha ga-agba mbọ hụ na ha nwere onwe ha.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ha gburu ọkụkọ ruru otu narị puku, na puku iri atọ na abụọ na narị ise(132,500).
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ha kwụ ha n’azụ.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ha nọ n’orụ n’akụkụ Mmiri Chad.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ịgwa Buhari okwu abaghị uru makana Buhari nwere ntị mana o jighi ya anụ ihe.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na ihe nile a mere na Ngwo na Ọzala.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na Kanada na-atụ anya na Nigeria ga-eme ọfụma karịa na-afọ 2015.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na mbụ o nweghị onye ma ihe gọọmenti na-eme, na etu ha si eji ego arụ ọrụ, mana ugbu a, APC mere ka ihe nile doo onye ọbụla anya.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na mmachi a ga-adị ire ganye na ọnwa atọ agasịa.
Leipzig Corpus Collections
O kwuru na Naijiria bụ nnukwu obodo Chukwu gọziri agọzị.
Leipzig Corpus Collections